Skip to content

NLC GA-EBIDO ABỤBỌNỤ N’ỤBỌCHI TỌZDE

Otu jikọrọ ndị ọrụ n’ala anƴị bụ ‘Nigerian Labour Congress (NLC) ekwuola na ha ga-ebido abụbọnụ n’ụbọchị Tọzde nke ịzụụka a.  Nke a bụ n’ihi nnụpụ isi nke ọchịchị etiti gbasara ụgwọ ọnwa ọhụrụ.

Ndị NLC kwuru nke a mgbe ha mechara nzụkọ na Legọs na Mọnde.

GUKWUO: BEN BRUCE, RENO OMOKRI ETOLA DAVIDO MAKA ENYEMAKA YA NA NTULIAKA EMERE N’OSUN

N’ozi ya, Joe Ajaero bụ onyeisi ‘United Labour Congress’ (ULC) kwuru na ndị ọrụ adịla njikere maka nke a.

A ga-echeta na ndị NLC nyere ọchịchị etiti mkpụrụ abalị ịrị na anọ imejuputa ụgwọ ọnwa ọhụrụ bụkwa nke ga-agwụ echi bụ Wednezdee.