Skip to content

N’IKPEAZỤ, DROGBA ACHISALA AKPỤKPỌ ỤKWỤ O JI AGBA BỌỌLỤ

Nwaamadi mba Afrịka na Code d’voire ama ama n’egwuregwu bọọlụ bụ Didier Drogba achịsala akpụkpọ ụkwụ ya n’ihe gbasara egwuregwu bọọlụ ka ọgbara afọ ịrị anọ.

Ọ chịsara akpụkpọ ụkwụ ya dịka ndị òtù egwu bọọlụ Louisville City jịrị otu ọkpụ goolu merie òtù egwu bọọlụ ya bụ Phoenix n’abalị gara aga.

Mgbe ọ na-agbara òtù egwu bọọlụ Chelsea boọlụ, o nwetara ọtụtụ ihe nrite nakwa mịdalụ.

O nwetakwara mmeri ugboro abụọ dịka ọkacha ibe na mba Afrịka.

didier-drogba-isimbidotv