Skip to content

NDI UWEOJII ANWỤCHIELA NWOKE AHỤ GBỤRỤ CHIGOZIE

Ndị uweojii no na steeti Anambra anwụchiela nwoke ahụ gbụrụ Chigozie Emmanuel Aghaji bụ onye na-erere ya mmanụ ụgbọala na Okpuno Nnewichi, Nnewi.

Ọ bụ onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed kwuru nke a.

Nwoke a magbụrụ Chigozie bụ onye gbara afọ ịrị abụo na ise n’ihi ego dị pụkụ naịra ịrị anọ bụkwa nke a na-achọ achọ n’ebe ahụ a na-ere mmanụ ụgbọala.

Nwoke a boro Chigozie ebubo maka iwere ego ahụ bụkwa nke ọ gọnarị.

Chigozie gwakwara ya ka owepụ pụkụ naịra ịrị anọ ahụ na-efu efu n’ụgwọ ọnwa ya nke ọnwa Nọvemba. Mana Chigozie amaghị na nwoke a nwere ebunuche ọzọ.