Skip to content

NDỊ OTU NZUZO EWETALA ỌGBAGHARA N’OLILI OZU ONYE OTU HA NA STEETI BAUCHI

Otu onye otu nzuzo bụ Dindira Yusuf,   ka ndị otu nzuzo ọzọ nọrọ n’ụbọchị Tuzdee kpọọla ala mụọ n’ike na steeti Bauchi. Ha jịrị mma maa ya n’obi bụkwa nke butere ọnwụ ya.

Ihe butere ọnwụ ya bụ mgbe ha nwere nghọtahe ebe ha na-eme oriri na kwari bụkwa nke ụmụ okorọbịa nọ n’ogbe ya haziri.

Gukwuo:Mgbawa Ịkụkụ gas egbuola ihe karịrị mmadụ ịri na steeti Nasarawa

A gakwara n’ihu kọwaa na ọnwụ ya were ndị otu ya iwe nke ukwuu bụkwa nke mere na nsogbu daputa mgbe a chọrọ ili ya n’ihi na ndị otu ya juru na-agaghị eli ya tupu a chọputa ndị gburu ya.

Ọ bụ ndị nche nọ ọrụ n’ebe ahụ mere ka nsogbu ahụ belata.

Onye na-ahụ maka ihe gbasara ndị mmadụ na ndị uwe ojii na steeti ahu bụ DSP Kamal Datti Abubakar kwuru na otu onye ka e gburu n’ọgụ ahu dapụtara n’etiti ndị otu nzuzo ahụ.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ha ga achọputa ndị kpara arụ ahụ.