N’abalị mbụ nke ọnwa Febụwarị ka ọchịchị steetị Legọs bidoro iwu bụkwa nke machiri ndị ọkada na keke n’ọtụtụ ebe na Legọs. Mmachi a dịka ha si kwuo bụ iji belata ohi nakwa agwa ndị ọzọ jọgburu onwe ya, bụkwa nke eji ọka na keke eme na gburugburu Legọs.
Mana kamgbe mmachị a bidoro, ọtụtụ ndị mmadụ akwaala akwa arịrị n’ihi nsogbu nke a butere ha. Ịhuzi ọkada na keke bụzi nsogbu. Ụgbọala na-aga ebe ndị a amabidoro ọkada na keke ịga ebughị ibu bụkwa nke na-ebute ndị mmadụ ịkwụ n’ahịrị ọtụtụ oge. Ọ bụghị naanị nke ahụ, ego ndị mmadụ na-akwụzi maka ime njem arịala elu ọjị.
N’ebe ịhuzi ụgbọala bụzi nsogbu, ndị mmadụ na-ejizi ụkwụ aga ogologo oge tupu ha eruo ebe ha na-aga. Nke a na-ebutere ụfọdụ ndị ike ọgwụgwụ, ụkwụ mgbụ na ọrịa.
Ọtụtụ ndị mmadụ emeela ngagharị iwe maka nke a, ma kpọ aka na-achị steeti Legọs bụ Babajide Sanwo-Olu ka owepu iwu a ọ machiri.
Ajụjụ wee bụrụ, ọchịchị steeti Legọs ọ ga-aṅa nti na mkpu na akwa arịrị ndị mmadụ na-ebe?