Skip to content

NDI JI EGBE ATỌRỌLA ỤMỤ AKWỤKWỌ DI ịRị ASAA NA ITOLU NA MBA CAMEROON

Ndị oji egbe bụkwa ndị chọrọ nkewa nọrọ n’ụbọchị Sọnde tọrọ ụmụ akwụkwọ dị ịrị asaa  na itolu n’otu obodo dị na Nkwem nke dị na mba Cameroon.

Nke a mere n’otu obodo dị nso na Bamenda bụkwa ebe a na-enwe ọgbaghara n’ebe ọ dị ụkwụ kamgbe terela aka.

Ụmụ akwụkwọ ndị a atọrọ bụkari ụmụ nwoke. A tọkwara otu onye nkụzi ha nakwa onye na-akwọrọ ha ụgwọala.

Ndị a tọrọ ụmụ akwụkwọ ndị a kwụrụ na ha agaghị ahapụ ha tụtụ rụọ mgbe emejụpụtara ihe ha chọrọ.