Skip to content

NDI BOKO HARAM AWAKPOLA OBODO ATỌ NA STEETI BORNU MA GBUO MMADỤ ISII

Ndị oji ịsị aghọ mgbọ bụ Boko Haram awakpola obodo atọ na steeti Bornu ma gbuo mmadụ ịsịị. Ha mụnyekwara obodo atọ ndị dị na Maiduguri bụ ịsị ọchịchị steeti ahụ ọkụ.

GUKWUO: ONYEISIALA EKWEGHACHILA NDI ỌRỤ NKWA N’IHE GBASARA ỤGWỌ ỌNWA ỌHỤRỤ

N’ozi nke onye na-ahụ maka gbata gbata na mpaghara ahụ (NEMA), bụ Bashir Garga zipuru n’ụbọchị Tọzdee, o kwuru n’obodo ndị nke a metutara gụnyere Wanori, Kaleri na Amarwa, bụkwa ndị nọcha na Konduga.

Ndị nọ mgbe nke a mere gwara ndị gbataara ha ọsọ enyemaka na ndị oji isi aghọ mgbọ a bịara gbawa egbe n’ebe niile, burukwa ihe orịrị ha, tupu ha amụnye ebe niile ọkụ.