Onyeisiala bụ Mouhammadu Buhari agwala òtù na-ahụ maka ime ntuliaka n’ala anyị bụ ‘Independent Electoral Commission’ (INEC) na asambodo ndị o jịrị gaa akwụkwọ ka nọ n’aka ndị agha ala anyị.
Buhari gwara INEC nke a n’Abuja mgbe ha na-achịkọba aha ndị niiile ga-eji aha òtù pati dị iche iche dọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2019.
GUKWUO: E NWEGHị MGBE M KWURU NA NAịJIRịA GA-ALỤSO ISRAEL AGHA – LAI MOHAMMED
Onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakara na ndị ọzọ ewetala nke ha.