Skip to content

Mgbawa Ịkụkụ gas egbuola ihe karịrị mmadụ ịri na steeti Nasarawa

Ọkụ nke sitere na mgbawa Ịkụku gas nọrọ na Monday na Monaco Gas Station dị na Lafia, Nasarawa State, gbuo ihe karịrị mmadụ ịrị ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

Ihe kpatara ọkụ a bụ n’ihi ugbọala na-ebu mmanụ gas bukwa nke na-ehi ehi ihe karịrị mkpụrụ ụbochi atọ banyere ọkụ.

Onye isi na-ahu maka ụlọ ọrụ imenyụ ọkụ na steeti ahu bụ maazi Adam Saibu, kwuru na ọ nọ n’ọfịs ya mgbe ọ nuru mkpọtu na mkpu ndị na-akpọ maka enyemaka.

A kpọro ndị na-ahu maka ịmenyu okụ n’ala anyị bụkwa ndị biara nye aka menyuọ ọkụ ahụ. Ndị na-ahu maka njem okporo ụzọ bụ FRSC na ndị uwe ojii bugara ọtụtụ ndị meruru ahu ụlọ ọgwụ.

ETHOPIA NA-EMEPE IHE NNOCHIANYA NA ERITREA

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ, ASP Ismaila Usman, kwuru na ha enwetela akụkọ banyere ihe ahụ merenụ, na-agbakwụnye na-achọputabele mmadụ ole nwuru na njinji ahu.

Ndị ụlọ ome iwụ nke steeti Nasarawa kwuru na n’oge na-adịghị anya na ha ga emeputa iwu ga-egbochi ndi mmadụ ire mmanụ gas n’ebe mepere emepe na steeti ahu.

Onye na-ekwuchitere ndị ome iwu ahụ ọnụ bụ Maazi Ibrahim Balarabe-Abdullahi kwuru nke a mgbe ha gara leta ogbe ebe njinji ahu jiri.