Skip to content

MGBAGA AHỤ NA ỤRỤ Ọ BARA NA NDỤ MMADỤ

Mgbaga ahụ maọbụ ‘Excercise’ n’olu ndị bekee bụ mmadụ ịnọ n’agbaga ahụ ya oge niile, iji mee ka ahụ dị onye ahụ ike. Mgbaga ahụ nwere ọtụtụ ụrụ ọ bara na ndụ ndị mmadụ.

Ọ na-enye aka ime ka ọbara nọ n’ahụ mmadụ na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ na-achụ orịa ọbara mgbali elu na ọrịa mamịrị ọsọ ụkwụ erughị ala.

Ọ na-eme ka mkpụrụ obi mmadụ na-arụ ọrụ n’ụdị o kwesiri.

Ọ bụ nke a mere ndị dọkịta oyibo ji agwa ndị mmadụ ka ha n’agbaga ahụ ha oge niile iji zere ụfọdụ ọrịa.

Lee ihe onyonyo ka ịmata ihe gbasara mgbaga ahụ nke ọma.

 

#ỤtụtụỌmaNỤ: MGBAGA AHỤ NA ỤRỤ Ọ BARA NA NDỤ MMADỤ: https://t.co/Dm6oNWMwP8 via @YouTube

— IsimbidoTv (@isimbidotv) October 24, 2018