Skip to content

MESSI ENWETALA IHE NRITE DIKA ỌKAIBE N’EGWUREGWU BỌỌLỤ NA MBA SPAIN

Nwaamadị mba Argentina bụkwa onye na-agbara òtù egwu bọọlụ Barcelona bọọlụ bụ Lionel Messi nọrọ n’abalị gara aga nweta ihe nrite dịka ọkaibe n’egwuregwu bọọlụ bụkwa nke Laliga hazịrị.

Messi nwetara ihe nrite abụọ. Ihe nrite nke mbụ bụ nke Alfredo Di Stafeno bụkwa nke a na-enye onye kacha agba bọọlụ na Laliga. Nke abụọ bụ nke Pichichi bụ nke a na-enye onye kacha sunye goolụ.

Ọ bụ onyeisi Marca bụ Juan Ignacio na onyeisi Laliga bụ Javier Tebas nyere ya ihe nrite ahụ.