Skip to content

LUKA MODRIC ENWETALA IHE NRITE NKE FIFA DIKA ỌKAIBE N’EGWU BỌỌLỤ

Luka Modric bụ nwa mba Croatia nọrọ n’ụbọchị Mọnde na London nweta ihe nrite dịka ọkaibe n’egwu bọọlu n’ụwa niile. Nrite a bụ nke otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n’ụwa niile bụ ‘Federation of International Football Associationa’ (FIFA) na-akwado.

GUKWUO: NLC GA-EBIDO ABỤBỌNỤ N’ỤBỌCHI TỌZDE

Modric meriri Cristiano Ronaldo, Mohammed Salah iji nweta ihe nrite a.

Nwamadị mba Croatia nwetara ntụrụ ugo a n’ihi mbọ ya nye otu egwu bọọlụ ya bụ Real Madrid bụkwa ndị nwetara iko ‘Champions League bụkwa nke UEFA na-akwado . Ọzọ  bụ igba mbọ ya nyeere obodo ya bụ Croatia n’egwuregwu otu na-ahụ maka egbu bọọlụ na mba mba ụwa bụ FIFA haziri n’ọnwa June afọ a.