Skip to content

KWỤSI IFESA EGO NA MMEMME MAỌBỤ GAA MKPỌRỌ – CBN KWURU

Ụlọ ọba ego n’ala anyị bụ ‘Central Bank of Nigeria’ (CBN) enyela iwu ka ndị mmadụ kwusi ịnọ n’efesa ego ala anyị bụ naịra na mmemme ọ bụla n’ihi na  ọ na-agba ego ala anƴị mgba okpụrụ.

Onye na-ekwuchitere CBN ọnụ bụ Maazị Isaac Okorafor kwuru na onye ọ bụla ahụrụ n’eme nke a ga aga mkpọrọ ọnwa ịsịị maọbụ kwuo pụkụ naịra ịrị ise.

GUKWUO: NDị UWEOJII ANWỤCHIELA OTU NWOKE MAKA IMEPỤTA MMANYA ỌKỤ ADIGBOROJA

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii na ministri na-ahụ maka ikpe ziri ezi ga-enye aka ihu na nke a gara nke ọma.

O kwuru sị “Ọ bụrụ na ahụ gị na mmemme ebe Ị na-efe onye na-eme mmemme ego, Ị ga-agata n’ebe ahụ gaa ụlọ mkpọrọ n’ihi na ndị uweojii ga-anwụchi gị ozugbo. Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị nche Ịnwụchi gi ma kpọga gị ụlọikpe. Ọ bụrụ na Ị chọrọ inye onye n’eme mmemme ego, tinye ya n’ime akwụkwọ eji etinye ego ma nye ya. Onye ọ bụla ahụrụ n’ere maọbụ dere ihe n’ego naịra, onye ahu ga-aga mkpọrọ ọnwa ịsịị maọbụ kwuọ pụkụ naịra ịrị ise”.