Skip to content

KANO 2019:  A GAGHI AGBANWE AHA GANDUJE – APC

Dịka a na-enyocha aka na-achị steeti Kano bụ Abdullahi Umar Ganduje gbasara iri ngarị, ozi si n’isi ọchịchị pati APC n’ala anyị ekwuola na ha agaghị agbanwe aha Ganduje na ntuliaka elu nke afọ 2019.

Otu akwụkwọ akụkọ nọ n’igwe ọlọrọ ọhụrụ nọrọ n’ihe dịka otu ọnwa gara aga gosi ihe onyonyo na-eso ebe Ganduje n’eri ngarị bụkwa nke rụrụ nde dọla ise.

Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi nke APC bụ maazị Lanre Issa-Onilu ekwuola na Ganduje ka bụkwa onye ga-eji aha pati ahụ dọọ ọkwa gọvanọ na steeti Kano na ntuliaka nke a ga-eme n’afọ ọzọ.

Onilu kwụrụ na ọ bụ naanị ọnwụ, ụlọikpe maọbụ onye sị na ya achọghị ịzọ ọkwa ka e nwere ike ịgbanwe aha ya.

O kwụkwara na ka ọ dị ụgbụ a, na Ganduje ka bụ onye ga-eji aha APC dọọ ọkwa gọvanọ na steeti Kano.