Skip to content

IRI JI ỌHỤỤ ENUGU-UKWU AHỌ 2017

Obodo jupụtara nnọọ gbịm n’ọnụ dịka a nọrọ n’izu ụka gara aga wee mee mmemme iri ji ọhụụ nke obodo Enugwu-Ukwu, dị n’okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra. Ya bụ mmemme omenahọ bụ nnọọ oge iji kele Chukwu Okike maka ọrụ ọma ya dị iche iche na ya bụ obodo, ọ kachasị otu o siri debe ha ndụ ogologo oge ahọ ọrụ niile wee rukwaa n’oge owuwe ihe ubi, nke gosiri nnọọ na onye rụọ n’anwụ o  rie na ndò.

Ka ọ na-ekwu okwu na a ya bụ mmemme, eze ọdịnala Enugwu-Ukwu bụ Igwe Maazị Ralph Ekpeh kelere ndị niile siri n’ebe dị iche iche wee bịa ya bụ mmemme maka na ọ bụ mmadụ ka e ji aka; ma sịkwazie na o nwere nnọọ ezi olile anya na owuwe ihe ubi nke ahọ na-abịa abịa ga-aka nke ahọ a.

GWO NKA: GỌỌMENTI ANAMBRA GA-EME KA AMỤMA N20M MMEPE IME OBODO BAA N’USORO ỌCHỊCHỊ

Ọ sị na ya bụ irii ji ọhụụ ọha obodo riri ga-emezị ka  ndi echichi dị iche iche n’obodo ahụ malitezie iri ji ọhụụ, n’ihi na dịka ọ dị n’ọtụtụ obodo dị iche n’ala Igbo gbaa gburu gburu, iri ji ọhụụ n’obodo bụ ahụghị ebuli ma sị elina dike ma sorokwa n’ihe mbụ na mbụ a ga-emerịrị tupuu onye echichi ọbụla amalite isi ma ọ bụ iri ji ọhụụ n’ụlọ be ya.

Ndị obodo ahụ anọrọnarii n’ọnwa Julaị gara aga wee mee otu n’ime mmemme pụrụ iche e jiri mara ha, bụ “Ịkpọ Ji”, nke bụ omenala ha ga-emechaa tupuu a malite ire ji n’ahịa obodo ahụ bụ Nkwọ Enugwu-Ukwu, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ sitere n’ebe dị iche iche n’ala Naịjiria nakwa mba ofesi.

Igwe Ralp kpekwazịrị ekpere maka udo na ọganihu nke obodo ahụ, steeti Anambta  nakwa ala Naịjiria n’izugbe.

Ọtụtụ ndị ukwu ndị ọzọ bịara mmemme ahụ gụnyere onye na-nọchite anya ọgbọ nta nkwado Anọcha, Dunukọfịa na Njikọka n’ụlọ ọgbakọ nnọchi anya etiti, bụ Dọkịnta Dozie Nwankwọ, onye isi na ọga kpata kpata nke ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service’, Awka, bụ Nze Uche Nwọrah, onye isi otu pati APGA n’oge mbụ ma bụrụkwa onye isi otu ịchụ nta nkwado maka ịhọpụtagharị Gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ, bụ Maazị Victor Umeh, na ọtụtụ ndị ọzọ.