Skip to content

IPOB echebirila ndị gọvanọ anọ

Ndị òtù Indigenous People of Biafra (IPOB) adọọla ndị gọvanọ anọ nọ n’ala Igbo aka na ntị ka ha hapụ ime njem gaa mba ofesi ma ọ bụrụ na ha achọghị ka ha wakpoo ha.

Ọ bụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nyere iwu a n’ozi ọgbasara n’ụbọchị Sọnde site na redio biafra.

Ndị òtù a na-achọ nnwere onwe, nọrọ n’ụbọchị Satọdee wakpo ma kụọ osote onyeisi ụlọ nzụkọ omeiwu ala anyị n’oge gara aga bụ Ike Ekweremadu ihe dịka ọ gara njem na mba Gamanị. Ekweremadu gbara ọsọ ndụ dịka ndị òtù a gbakọrọ ma kụọ ya ihe.

Ndị gọvanọ ndị a gunyere Dave Umahi (Ebonyi), Ifeanyi Ugwuanyi (Enugwu), Willie Obiano (Anambra) na Okezie Ikpeazu (Abia).

Onye gọvanọ sị ala Igbo n’esoghị na ya bụ aka na-achị steeti Imo bụ Emeka Ihedioha.