Skip to content

IHE MGBEREDE OKPORO ỤZỌ EGBUOLA MMADỤ ịRị NA ASATỌ NA GOMBE

Mmadụ ịrị na asatọ nọrọ n’ụbọchị Wenezdee nwụọ n’ihe mgberede mere na steeti Gombe.

Ndị a nwụrụ anwụ bụ ndị n’azụ ahịa bụkwa ndị jị ụgbọala si na Bauchi n’aga Gombe maka nzụkọ ha n’enwe n’ịzu ụka ọ bụla.

GUKWUO: NYE NDỊ ỌRỤ UGBO IDE MMịRị MEBIRI UGBO HA EGO ITI AKA N’OBI – EZE ONYIA

Ihe butere ihe mgberede a edochaghị anya mana otu onye nọ mgbe o mere kwuru na ọ bụ okporo ụzọ ọjọọ butere ya.

Ụmụ nwoke ndị a niile tufuru ndụ ha hapuru ụmụ ha na nwunye ha nwụọ.