Mmadụ ịrị na asatọ nọrọ n’ụbọchị Wenezdee nwụọ n’ihe mgberede mere na steeti Gombe.
Ndị a nwụrụ anwụ bụ ndị n’azụ ahịa bụkwa ndị jị ụgbọala si na Bauchi n’aga Gombe maka nzụkọ ha n’enwe n’ịzu ụka ọ bụla.
GUKWUO: NYE NDỊ ỌRỤ UGBO IDE MMịRị MEBIRI UGBO HA EGO ITI AKA N’OBI – EZE ONYIA
Ihe butere ihe mgberede a edochaghị anya mana otu onye nọ mgbe o mere kwuru na ọ bụ okporo ụzọ ọjọọ butere ya.
Ụmụ nwoke ndị a niile tufuru ndụ ha hapuru ụmụ ha na nwunye ha nwụọ.