Skip to content

IHE MERE ADELEKE AGAGHI EJI NWETA MMERI NA MMEGHARI NTULIAKA – APC

Otu pati APC ekwuola na Ademola Adeleke agaghị enweta mmeri na mmegharị ntuliaka a ga-eme n’ụbọchi Tọzdee ọbụrụgodi na ya enweta nkwado nke Iyiola Omisore bụ onye ji aha otu pati ‘Social Democratic Party’ (SDP) na-adọ ọkwa gọvanọ.

GUKWUO: IDE MMIRI EGBUOLA NWA NỌ AFỌ ITOLỤ N’ANAMBRA STEETI

N’ozi nke onye mgbasa ozi otu pati APC na steeti Osun bụ Kunle Oyatomi weputara n’ụbọchị Tuzdee, o kwuru na Adeleke etozughị oke ibu aka na-achị steeti ahụ.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na kamgbe ntuala ndorọndọrọ ọchịchị bidoro na steeti Osun, nke a bụ nke mbụ ya onye na-etozughi etozu dịka Adeleke na-aputa ịzọ ọkwa gọvanọ.