Skip to content

Ihe karịrị mmadụ iri atọ anwụọla dịka tanka gbawara na Benue

 

Tanker explosion in Benue state

Njinji jiri n’ụbọchị Mọnde izu ụka a dịka ọtụtụ ndị mmadụ tufuru ndụ ha dịka ụgbọala na-ebu mmanụ dara ma gbawa n’Ahumber nke dị n’okpuru ọchịchị Gwer, Benue steeti. Ọtụtụ ndị mmadụ nwetakwara ihe mmeru ahụ dị iche iche.

Ụgbọala a bụ mmanụ na-aga isi ọchịchị steeti ahụ bụ Makurdi mgbe nke a mere. Ụgbọala a dara mgbe onye ọkwọ ụgbọala na-eze ebe ndị na-adịghị mma dị n’okporo ụzọ ahụ.

Ozugbo ụgbọala ahụ dara n’akụkụ ọhịa, ndị obodo gbaputara ka ha bịa kuru mmanụ ụgbọala, mana mgbe ha na-eme nke a, tanka ahụ gbawara ozugbo ma laa ọtụtụ ndụ n’iyi. Ọtụtụ ndị meruru ahụ ka akpọgarala ụlọọgwụ maka ịnara ọgwụgwọ.