Skip to content

IGP ENYELA IWU KA ANWỤCHIE NDI UWEOJII GBURU ANITA

Onyeisi ndị uweojii n’ala anyị bụ Ibrahim Idris enyela iwu ka anwụchie ndị uweojii mmadụ anọ bụkwa ndị gbụrụ otu nwaada aha ya bụ Anita Akapson bụkwa onye si mba ‘United Kingdom’ lọta n’afọ gara aga.

Anita bụ onye na-arụrụ ‘National Emergency Management Agency’ (NEMA) ọrụ.  Ndị uweojii nọrọ na ngwụcha izu ụka gara aga gbuo ya n’Abuja n’ebe a na-akwụsi n’enyocha ndị mmadụ.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ bụ Jimoh Moshood ekwuola na IGP enyela onye Kọmishịọna na-ahụ maka ndị uweojii n’Abuja bụ Bala Ciroma iwu ka ọnwụchie ndị uweojii mmadụ anọ a kpara arụ a.