Skip to content

KWỤSI IGBARA ARGENTINA BỌỌLỤ, KA MARADONA GWARA MESSI

Nwaamadị mba Argentina ama ama n’egwuregwu  bọọlụ n’oge gara bụ Diego Maradona agwala Lionel Messi ka ọ kwụsị igbara Argentina bọọlụ.

Messi agbaberala Argentina boọlụ kamgbe France gbapuru ha n’iko mba ụwa a gbara na mba Russia. Ọ bụladị egwuregwu enyi na enyi Argentina na mba Guatemala, Colombia gbara n’oge gara aga, Messi esoghị gbaa ya.

GUKWO: AMBODE NA SANWO-OLU: UGO EBERELA NA MGBAGBỤ  

Ihe gbasara Messi igbara Argentina bọọlụ bụ ihe ọ na-emebeghị ka ndị Argentina mara ọ bụladị ka o kwuru n’afọ 2016 na ya agaghị agbara Argentina bọọlụ ọzọ.

Maradona kwuru sị: “A ga m achọ ka Messi kwụsi igbara Argentina bọọlụ. Ọ bụghị ya mere anyị ebuteghị iko mba ụwa. Ọ bụ eziokwu na anyị tinyere nchekube anyị niile na ya. Mana mgbe ụfọdụ, ọ naghị adị ka e chere”.