Skip to content

IDE MMIRI EGBUOLA NWA NỌ AFỌ ITOLỤ N’ANAMBRA STEETI

Ide mmịrị bụkwa nke na-enye ụfọdụ ebe nsogbu na steeti Anambra egbuola nwa nọ afọ itolụ aha ya bụ Benedict Uzo, onye Amaiyi, Ọgbaru.

Maazi Arinze Awogu  bụ onye nnọchịte anya  nke mpaghara ọchịchị Ogbaru L.G.A, kwuru na nwata  nwaanyị a nwụrụ mgbe ọ gara ikụte mmịrị.

GUKWUO: E NWEGHỊ MGBE M KPỌRỌ TINUBU N’EKWE NTI GBASARA AMBODE – ADEBOYE

Awogu gakwara n’ihu kwuo na nwanne nwata a nwụrụ anwụ fọrọ nkakịrị ka otufuo ndụ ya n’ebe ọ na-achọ ịzọputa nwanne ya, mana ndị agbata obi nyere aka zọpụta ya.

Ọ bụghị naani nke a, Agwogu kwukwara na mmadụ abụọ anwụola kamgbe ide mmịrị a bidoro n’Ọgbarụ.

Onye nnọchite anya a yọrọ ndị bị n’ebe ide mmịrị na-akpa ike ka hapụ kwapu ozugbo n’ebe ide mmịrị n’agaghị enye ha nsogbu.

O kwuru na ha chọrọ ụlọọgwụ dị mma iji belata ihe mgbụ a.