Skip to content

IDE MMỊRỊ DỊ N’ANAMBRA, DELTA, KOGI NA NIGER AGHỌLA IHE ỌJỌỌ N’ALA ANYỊ – NEMA   

Otu na-ahụ maka gbata gbata n’ala anyị bụ ‘National Emergency Management Agency (NEMA) ekwuola na ide mmịrị n’akpa ike na steeti Anambra, Delta, Kogi nakwa Niger aghọla ihe mgbụ n’ala anyị bụ Naịjịrịa.

Onyeisi otu a bụ Engr. Mustapha Maihaja kwuru nke a na Wenezdee mgbe ọ gara njem nlegharị anya na Lokoja, bụkwa ebe ọ nọ chọpụta na ide mmịrị emenuọla ụfọdụ akụkụ obodo ahụ anya.

GUKWUO: E NWEGHỊ MGBE M KPỌRỌ TINUBU N’EKWE NTI GBASARA AMBODE – ADEBOYE

O gakwara n’ihu kwuo na ha na elebara steeti asatọ ọzọ bụkwa ndị ide mmịrị na-enye nsogbu anya tupu ruo mgbe ha ga-enweta akụkọ gbasara ide mmịrị ahụ n’uju.

Maihaja na-akpọ otu mba ụwa ka ha gbatara steeti anọ ndị ọsọ enyemaka ọkachasị ndị na-ata oke ahụhụ n’ihi ihe ide mmịrị butere ha.

O kwukwara na ha ga edegara onyeisiala akwụkwọ gbasara ụzọ a ga-esi kwụsi ike ide mmịrị na-akpa.