Skip to content

IBATA N’APC AGAGHị AZỌ GI – NABENA GWARA FAYOSE

APC agwala gọvanọ na-achị steeti Ekiti bụ Ayodele Fayose na ihapu pati ya bụ PDP gbabata n’APC agaghị akwụsi ikpe a ga-ekpe ya.

Ọ bụ onye odeakwụkwọ n’ihe gbasara ọhanaeze nke APC bụ Yekini Nabena kwuru nke a.

Nabena gara n’ihu kwuo na ọ bụrụ na Fayose chee na ibata na APC ga-azọ ya, na nke a bụ asị.

GUKWUO: KEDỤ ONYE I CHERE GA-ENWETA MMERI NA BALLON D’OR NKE AFỌ A?

Nabena kwuru sị “Pati anyị bụ pati ọganịịhụ. Onye ọ bụla dara iwụ, a ga-eji ụkpụrụ iwụ nyere were kpee ya ikpe. Ọ bụrụ na Fayose chere na-ibata n’APC ga-azọ ya, nke a bụ asị. A chọpụta na ọ dara iwụ, a ga-ekpe ya ikpe dịka iwụ sị dị”.

A ga-echeta na Fayose nọrọ n’ụbọchị Mọnde kwuo na ya nwere ike ihapụ PDP.