Skip to content

FAYOSE EKWUOLA NA YA GA-AZA NDỊ EFCC OKU N’ỌNWA IRI N’AFỌ A

Gọvanọ na-achị Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose ekwuola na ya ga-aza ndị EFCC oku ma ọnwa ịrị gbaa abalị ịrị na ịsịị, bụkwa mgbe oge ya dịka gọvanọ na-achị steeti Ekiti ga-abịa n’isi njedebe.

Fayose kwuputara nke a n’akwụkwọ o degara ndị otu EFCC n’ubọchi Tuzdee, abalị ịrị na otu nke ọnwa a anyị nọ n’ime ya.

Gukwuo: BUHARI GA-EME NJEM NA NEW YORK MAKA NZỤKỌ OTU MBA ỤWA

Anyị ga-aghọta na oge ọchịchị ya dịka gọvanọ steeti ahu ga-abịa na njedebe ma ọnwa ịrị gbaa abalị ịrị na ise. Fayose ekpebiela ịza oku a ndị EFCC na-akpọ ya kemgbe nọrọla ọtụtụ oge.