Skip to content

FASHOLA AGWALA NDị YORUBA KA HA TUNYERE BUHARI VOOTU IJI MEE KA NDị YORUBA LỌGHACHị N’ỌCHịCHị N’AFỌ 2023

Onye minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ obibi bụ Babatunde Raji Fashola agwala ndị Yoruba ka ha tunyere Buhari vootu na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019 iji mee ka ndị Yoruba nwee ike ịlọghachị n’ọchịchị n’afọ 2023.

Fashola kwụrụ nke a na nzụkọ  ha nwere bụkwa nke mịnịstrị na-ahụ maka mgbasa ozi haziri.

O kwuru na ndị Yoruba ga-enweta ọtụtụ ụrụ ma ọ bụrụ na ha atunyere Buhari vootu n’afọ 2019.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị Yoruba atunyere Buhari vootu, ọ ga-eme ka ndị Yoruba weghara ọchịchị n’afọ 2023.