Skip to content

EZEKWESILI GA-EJI AHA PAATI ACPN DOỌ ỌKWA ONYEISIALA N’AFỌ 2019

Onye buburu minista na-ahụ maka agaụmakwụkwọ n’oge gara aga bụ Oby Ezekwesili ga-eji aha òtù pati ‘Allied Congress Party of Nigeria’ (ACPN) dọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019.

O nwetara mmeri a n’ụbọchị Sọnde n’ọgbakọ ndị pati a nwere n’Abuja  n’ụbọchị Sọnde.

GUKWUO: OKOROCHA NA UCHE NWOSU EMERIELA NA NTULIAKA ONYE ỌGAARA NKE APC MERE

Ezekwesili kwuru n’ọrara ya ahụ inabata nke a. Ọ gakwara n’ihụ kwuo na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala iji kwusi mmegbụ na enweghị nchekwa dị n’ala anyị bụ NaỊjịrịa. O kwuru na onye ọ bụla ga-enweta ụgwụ ruru ya n’agbanyeghị agbụrụ ebe onye si.