Skip to content

EWEPULA ONYE NA-EKWUCHITERE ỤLỌ NZỤKỌ OMEIWU NKE STEETI ANAMBRA

Onye na-ekwuchitere ụlọ nzụkọ omeiwu nke steeti Anambra ọnụ bụ Rita Maduagwu ka a nọrọ n’ụbọchị taa wepụ dịka onye na-ekwuchitere ụlọ omeiwu ahụ ọnụ.

Nwaanyị a ka e wepuru n’ịhị amaghị ọrụ ya, ekweghị ekwe na aka ike. Maazị Ikem Uzoezie nọchịrị anya ya.

Uzoezie bụ onye na-anọchite anya ọgbọnta vootu Aguata II kwụrụ ka ewepu ya, n’ebe Onyebuchi Offor bụ onye na-anọchite ọgbọnta vootu Ekwusigo sochịrị ya.

GUKWUO: ỌGHỌM DI NA NFANYEAKA N’ỤKWỤ NKE ASUU N’EBE ỤMỤAKWỤKWỌ NỌ

Ndị omeiwu mmadụ ịrị abụọ na abụọ nọ ya mgbe nke a na-eme. Ọ bụ naani mmadụ atọ bụ ndị na-akwadoghị ya. Mmadụ ịrị na itolu ndị ọzọ kwadoro ka ewepu Rita Maduagwu. Ha wepuru ya ozugbo n’egbughi oge.