Skip to content

EREKWALA VOTU GI – CSOs GWARA NDI STEETI OSUN

Ndị otu ‘Civil Society Organisation’ (CSO) agwala ndị steeti Osun ka ha hapụ ire votu ha na ntụliaka maka ọkwa gọvanọ nke a ga-eme na Satọdee izụka  a.

Ha kwuru nke na Wenezdee  n’Osogbo mgbe ha na-eme ngagharị imegide ire votu na ntuliaka elu a ga-eme na steeti ahụ.

GUKWUO: IDE MMỊRỊ DỊ N’ANAMBRA, DELTA, KOGI NA NIGER AGHỌLA IHE ỌJỌỌ N’ALA ANYỊ – NEMA   

Ha gwara ndị Osun ka chefuo uru dị n’ire votu ha ma bịanyekwara onye ha chọrọ votu ha iji nweta ọganịhụ dị mma.

Maazị  Ariyo-Dare Atoye, bụ onye nchịkọta nke ‘Coordinator of  Coalition in Defence of Nigerian Democracy and Constitution’ (CDNDC), kwuru n’ire nakwa ịzụ votu na-agba ọchịchị onye kwuo uche ya aka, bụkwa nke a ga-agbali kwusi.

O kwuru na mmadụ ire votu ya dịka mgbe mmadụ rere ugbu ya nakwa ọganịhụ obodo ya.