Enweghị nchekwa na-echu onyeisiala ụra – Lawan, Gbajabiamila

0
Buhari, Lawan, Gbajabiamila

 

Buhari, Lawan, Gbajabiamila

Onyeisi ụlọ ọmeiwu ala anyị bụ Ahmad Lawan na onye na-ekwuchitere ụlọ nnọchiteanya bụ Femi Gbajabiamila nọrọ n’ụbọchị mọnde kwuo na ihe banyere enweghị nchekwa na-echu onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ụra.

Ndị nnọchịteanya ụlọ nzụkọ omeiwu a kwuru nke a mgbe ndị nta akụkọ na-agba ha ajụjụ ọnụ n’Abuja dịka ha na onyeisiala nwechara ọgbakọ.

Gbajabiamila kwuru na ndị nzụkọ omeiwu gwara onyeisiala mkpa ọ dị itinyekwu ego n’ebe ndị uweojii nọ nakwa iwekwụ ọtụtụ ndị n’ọrụ iji chụọ nsogbu enweghị nchekwa na-ebute ọsọ ukwu eru ala.

Lawan n’aka nke ya kwuru na enweghị nchekwa, bụkwa nke na-agba ala anyị mgba okpuru chọrọ ịgbakọ aka ọnụ.

Subscribe To Our Youtube

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here