Skip to content

ENWEGHI EBE Ọ BỤLA M N’EJE – EKWEREMADU

Osote onyeisi nke ụlọ nzụkọ omeiwu ala anyị bụ Ike Ekweremadu ekwela ndị nkwado ya nkwa na ya ka nọ na PDP. O kwụkwara na ya enweghị ebumnuche ịhapu pati ahu.

Ekweremadụ gara n’ihu kwuo na ndị enyi ya nọ n’akpọ ya n’ekwe nti kamgbe ụbọchị Tụzdee banyere nke a.

O kwuru n’akụkọ a nọ ebe niile ụgbụ a bụ asị.

GUKWUO: ỤLỌIKPE ANAALA FAYOSE N’AKAEBE N’ỌNỤ EGO DI NDE NAịRA ịRị ISE

O kelere ndị enyi ya niile na ndị nkwado ya maka enyemaka nakwa nkwado ha nyere ya.

O kwere ha nkwa na ya ka bụ onye òtù pati PDP.