Osote onyeisi nke ụlọ nzụkọ omeiwu ala anyị bụ Ike Ekweremadu ekwela ndị nkwado ya nkwa na ya ka nọ na PDP. O kwụkwara na ya enweghị ebumnuche ịhapu pati ahu.
Ekweremadụ gara n’ihu kwuo na ndị enyi ya nọ n’akpọ ya n’ekwe nti kamgbe ụbọchị Tụzdee banyere nke a.
O kwuru n’akụkọ a nọ ebe niile ụgbụ a bụ asị.
GUKWUO: ỤLỌIKPE ANAALA FAYOSE N’AKAEBE N’ỌNỤ EGO DI NDE NAịRA ịRị ISE
O kelere ndị enyi ya niile na ndị nkwado ya maka enyemaka nakwa nkwado ha nyere ya.
O kwere ha nkwa na ya ka bụ onye òtù pati PDP.