Skip to content

Enugu APC n’azọnzọ ịchu onye ozi

Okwu n’eso akụkọ: Onye ozi n’ahụ maka ihe ndi gbasara mba ọzọ –Geoffery Onyeama.

Ngalaba otu All Progressive Congress (APC) nke di n’obodo Enugu zọrọnzọ na ha ga achụtu onye ozi n’ahu maka ihe ndi  gbasara mba ọzọ (minister of foreign affairs) Mazi Geoffery Onyeama, maka okwuru n’oga-agbawe aha ndi ahọpụtara bụ ndi ga esonye n’emume ọgbakọ nke jikọrọ otu APC ọnụ n’obodo Nigeria nke n’abia.

Onye isi ọche ndi APC n’obodo Enugu–Dokinta Ben Nwoye, gbara egbe ọnụ mgbe ya ndi nta akụkọ nọ n’akparita ụka, mgbe ahụ ka oboro onye ozi ebubo “na ọna akụ mkpụrụ nkewa di iche iche” n’ime ngalaba APC nke di n’obodo Enugu.

Ọbụ ihe doro anya na ngalaba APC nke Enugu nọ n’ọgba-aghara kamgbe, maka na ụfọdụ kewapụrụ onwe ha ma chọọ ịchụtu Nwoye n’ọche.

Ben Nwoye si ọdika aka Onyeama di n’ọgba-aghara di otu APC ngalaba nke obodo Enugu, ebe oji aha ụfọdụ ndi amara-amara n’otu APC n’obodo Enugu bụ ndi n’anọghi mgbe emere emume nghọpụta aha were dochie aha ndi ahọpụtara bụ ndi nọ n’emume ahụ.

Nwoye si n’ugbua Onyeama kwetere n’ọbụ ya tinyere ọgba-aghara n’otu ṄAPC nke obodo Enugu, ahụhụ aga-ata ya bụ ịchụpụ ya n’otu APC kpata-kpata. Nwoye kwuru si n’egwu tụrụ ya maka ihe Onyeama mere nke iwu APC megidere ya nke ọma, (Article 21 of our party’s constitution).

Elebara ya nke ọma bụ ihe Onyeama mere ịwepụ aha ndi kwesiri ma tinye aha ndi n’ekwesighi, Onyeama kwetara na megidere ma mebikwaa iwụ ndi APC, mana ọsi n’ihe omere bụ ihe ọkpọrọ “ịme ka udo n’adi” Nwoye si na Onyeama kwesiri ịma ihe iwu ndi otu APC kwuru karia ịnọ n’eme ọnwe ya onye isi ọka ikpe.

Onyeama gbarụrụ ihu maka etu esiri kwarie ego ndoro-ndoro ọchichi nke otu APC nke ngalaba obodo Enugu n’afọ 2015 mgbe ana-abiye aka ọchichi.

Mana Nwoye zaghachiri Onyeama n’onweghi ihe gbasara ya n’ego ndoro-ndoro ọchichi, maka na mgbe ahụ ọbụrụbeghi otu onye n’ime otu ndi APC oge ana-azọ ọchichi n’afọ 2015.

Gbara k’amara ihe Onyeama g’ekwu maka ihe Nwoye zahachiri ya akụrụ afọ n’ala, mana ichọrọ imatakwu ka osiri gaa soro anyi n’ọha nta akụkọ anyi bụ: www.isimbido.tv