Skip to content

Emeka Ihedioha enyela ụmụafọ Imo abụọ agụmakwụkwọ n’efu

 

CHIZOBAM NA CHUKWUEMEKA

Aka na-achị steeti Imo bụ Emeka Ihedioha enyela ụmụafọ Imo abụọ mere nke ọma n’ule WAEC nke afọ a agụmakwụkwọ n’efu na Mahadum ọ bụla ha chọrọ n’ala anyị.

Ụmụafọ Imo abụọ a bụ Stephany Chizobam Ugboaja na Chukwuemeka Favour Alozie. Ha abụọ nwetara ‘A1’ itolu na rịzọọtụ WAEC ha.

Gọvanọ Ihedioha mere nke a iji gbaa ha ume maka ike a ha kpara.

Ha kelere gọvanọ Ihedioha maka afọ ọma a.

 

TRANSLATION

Emeka Ihedioha, governor of Imo state has awarded full academic scholarship to study in any university to the two best students from the state who came first and second in the 2019 West African Senior School Certificate Examination (WASSCE).

The students are Stephany Chizobam Ugboaja and Favor Alozie, who both scored ‘A1’ in all subjects in the 2019 WASSCE.

The gesture of sponsoring the students in any university of their choice in the country by Imo State Government is a celebration of excellence and hard work.