Skip to content

EKWEREMADU NWERE IKE IHAPỤ PDP

Ike Ekweremadu bụ onye bu osote onyeisi ụlọ nnọchite anya nwere ike ihapụ òtù pati PDP banye n’APC  na mkpụrụ ụbọchị ole n’ole n’abịanụ.

Ka ọ dị ụgbụ a, Ekweremadụ na ndị APC na-akparịta maka nke a.

Iwe n’ewe Ekweremadu ka ndị PDP si kpaso ya agwa kamgbe Bukola Saraki sịrị n’APC banye na PDP.

E nwetakwara akụkọ na iwe n’ewe Ekweremadụ n’ụdị agwa PDP kpasoro Saraki.

Otu onye APC ọnụ n’eru n’okwu ekwuola n’ọfọdụrụ mkpụrụ ụbọchị ole n’ole ka Ekweremadu sonye ha n’APC.