Skip to content

EGBUOLA NWAAFỌ ALA ANYỊ SO N’ÒTÙ NZỤZO NA MBA SOUTH AFRICA

Otu nwaafọ ala anyị so n’òtù nzụzo aha ya bụ Sunday Lucky Buchi ka a nọrọ n’ụbọchị Mọnde gbuo na mba South Africa.

E gburu ya mgbe e nwere ọgụ n’etiti ndị òtù ya na ndị òtù nzụzo ọzọ.

Buchi bụ onye so n’òtù nzụzo a na-akpọ ‘Eiya Cnfraternity’ ka e gburu n’ebe a n’eme ọrịrị na nkwarị. Ndị òtù nzụzo ‘Aiye Confreternity’ gburu ya iji megwara ogbugbu e gburu otu onye otu ha aha ya bụ Romeo ọnwa ole n’ole gara aga.

A ga-echeta na-egburu Romeo n’oge gara aga bụ onye so n’òtù nzụzo ‘Aiye Confraternity’ bụkwa ndị ama dịka ‘Black Axe Cult’.