Skip to content

EDUOLA KAYODE FAYEMI N’IYI ỌRỤ DIKA GỌVANỌ NA-ACHỊ EKITI STEETI

Onyeisi ndị ọkaikpe nke steeti Ekiti nọrọ n’ụbọchị taa duo Kayode Fayemi n’iyi ọrụ dịka aka na-achi steeti ahu. Nke a mere taa n’isi ọchịchị steeti ahụ dị n’Ado-Ekiti.

Fayemi merirị Fayose na ntuliaka maka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n’ọnwa asaa n’afọ a.

GUKWUO: SHITTU AKPỌPỤLA APC ỤLỌIKE

Fayemi buburu minister na-ahụ maka akụ ndị si n’ala tupu ya agbaa arụkwaghị m iji zọọ ọkwa gọvanọ steeti Ekiti.

E dụrụ ya n’iyi ọrụ n’ịhụ ndị òtù pati ya bụ APC nakwa ndị nkwado ya.