Skip to content

E NWEGHI MGBE Ọ BỤLA M HỌPỤTARA PETER OBI – WIKE

Aka na-achị steeti Rivers bụ Nyesom Wike ekwuola na aka ya adịghị na nhọpụta a họpụtara Peter Obi dịka onye ga-eji aha pati PDP zọọ ọkwa osote onyeisiala na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019.

O kwụrụ na ndị mmadụ chere na aka ya dị na nhọpụta a họpụtara Peter Obi.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na ọchịchị APC  enweghị ihe owetara n’ala anyị ma kwuo na ala anyị chọrọ ọchịchị ọhụrụ n’afọ 2019.

Nwike gara n’ihu kwuo na ndị gọvanọ ndị si Edo, Rivers, Bayelsa, Delta, Cross River, na Akwa Ibom na onyeisiala bụ Muhammadu Buhari nwere nzụkọ maka mmepe Niger Delta. O kwụrụ na nzụkọ ha abụghị maka ndọrọndọrọ ọchịchị.