Skip to content

E NWEGHị MGBE M KWURU NA NAịJIRịA GA-ALỤSO ISRAEL AGHA – LAI MOHAMMED 

Onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi n’ala anyị bụ Lai Mohammed ekwuola n’enweghị mgbe ya kwụrụ na Naịjirịa ga-alụso mba Israel agha ma ọ bụrụ na ha akpọlataghị onyeisi òtù IPOB bụ Nnamdi Kanu.

Lai kwuru na ya nọ na London mgbe ya nụrụ na a hụrụ Nnamdi Kanu n’Israel.

Ọ gara n’ihu kwuo n’akụkọ ụgha nọ n’ebe niile ọkachasi n’igwe mgbasa ozi ọlọrọ ọhụrụ bụ ‘Social Media’ bụkwa nke ga-abụ ọgbatuhịe nyere ntuliaka elu a ga-eme n’ala anyị n’afọ 2019.

O kwụkwara n’ewneghị ihe ọ bụla ya nwere ịkwụ banyere Nnamdi Kanu ụgbụ a. O kwụkwara na mgbe oge rụrụ, na ndị nke a gbasara ga-ekwu maka ya.