Skip to content

E NWEGHỊ MGBE M KPỌRỌ TINUBU N’EKWE NTI GBASARA AMBODE – ADEBOYE

Onye nlekọta otu ụka Redeemed Christian Church of God, (RCCG) bụ Pasitọ Enoch Adeboye ekwuola na-enweghị mgbe ya na onye ndu otu pati APC bụ Bola Tinubu kwuru n’ekwe nti gbasara ọchịchọ Ambode Ịbịaghachị azụ nke ugboro abụọ dịka aka na-achi steeti Lagos.

Gukwuo: OSUN 2018: E JILA EKWE NTI MAOBỤ KAMERA ABỊA N’EBE A NA-EME NTULIAKA, KA INEC KWURU

Adeboye kwuru nke a n’igwe mgbasa ozi ọlọrọ ọhụrụ bụ Twitter na Facebook. O kwuru na o nweghị mgbe ya ga-ewebata onwe ya n’ihe gbasara ọchịchị n’etiti otu ndọrọndọrọ dị iche iche n’ebe ọ bụla RCCG nọ n’ụwa niile.

Adeboye rịọrọ ndị ala anyị ka ha nweta akwụkwọ ga-enye ha ike ịbịanye aka na ntuliaka a ga-eme n’afọ ọzọ.