Skip to content

E NWEGHI MGBE ANYỊ KWỤRỤ NA BUHARI GA-ENWETA MMERI N’AFỌ 2019 – USIP

Òtù ‘United States Institute of Peace’ (USIP) agọrọla ọnụ ha ma kwuo na-enweghị mgbe ọ bụla ha kwụrụ na Buhari ga-enweta mmeri na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019.

USIP kwụrụ na-akwụkwọ akụkọ ndị nọ n’ala anyị aghọtaghị ihe ha kwụrụ nke ọma bụkwa nke ha buasara ebe niile n’ala anyị

GUKWUO: PDP EMEPELA IHE ONYONYO TV MAKA NTULIAKA ELU NKE AFỌ 2019  

USIP gara n’ihu kwuo na ha anaghị ekwuputa onye ga-emeri na ntuliaka kama ọrụ ha bụ ịnyere obodo ndị na-eme ntuliaka aka ka ahapu inwe ọgbaghara.

USIP kwụrụ na ha esoghị n’òtù pati ọ bụla kama ha na-enye aka ihu na ntuliaka gara nke ọma n’enweghị nsogbu maọbụ ọgbaghara ọ bụla.