Skip to content

E BIDORO M DIKA NWA ENWEGHI NNE NA-ERE NKỤ N’ADAMAWA – ATIKU

Onye ga-eji aha pati PDP dọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019 bụ Atiku Abubakar ekwuola na ihe sịrị ya ike mgbe ya na-etolite etolite, ma gbakwunye na ya bidoro dịka nwa enweghị nne n’ere nkụ na Jada bụkwa ebe a na-akpọ Adamawa taa.

Atiku kwụrụ nke a taa mgbe ọ na-amalite ịchụ nta vootu maka afọ 2019. Ọ bụ site na nwa nnụnụ ọgbaama ya bụ Twitter ka o kwụrụ nke a.

Atiku gara n’ihu kwuo na ụgbụ a bụ oge ime ka ala anyị bụ Naijịrịa rụwa ọrụ ọzọ. Ọ rịọrọ ndị ala anyị ka ha sonyere ya dịka ọ na-agba mbọ ime ka ala anyị dịkwa mma ọzọ.

Atiku jịkwara ohere ahụ kọwaputa ọtụtụ ihe ndị ọ ga-emere ala anyị ma ọ burụ na ya enweta mmeri na ntuliaka elu nke afọ 2019.