Skip to content

CHIMAMANDA ADICHIE ENWETALA IHE NRITE NKE EVERETT M. ROGERS NKE AFỌ 2019

Nwaada ala anyị ama ama n’ihe gbasara ide akwụkwọ n’ụwa nịịle bụ Chimamanda Adichie ka akwanyere ụgwu site n’ihe nrite nke  Everett M. Rogers  nke afọ 2019.

GUKWUO: URU IṄỤ MMỊRỊ BARA NA NDỤ MMADỤ

Ihe nrite a bụ nke a na-enye kwa afọ iji kwanyere otu onye ọkammụta laarala mụo ugwu bụ  Everett M. Rogers .

Ihe nrite a  bụ maka iji kwanyere Chimamanda ugwu n’ihi mbọ ya n’ebe ihe gbasara oke rụrụ ụmụ nwaanyị nakwa abụrụ. A ga-enye ya ihe nrite a n’ọnwa abụọ nke afọ 2019.