Skip to content

Charly Boy etoola ndị IPOB maka ihe ha mere Ekweremadu

Charly Boy and Ekweremadu

Charles Oputa, bụ onye ama nke ọma dịka Charly Boy etoola ndị òtù Indigenous People of Biafra (IPOB) bụkwa ndị wakporo ma kụọ Sịnatọ Ike Ekweremadu ihe na mba Gamanị.

Charly Boy kwuru na ndị IPOB kwesiri ịna aka nakwa ihe nrite pụrụ iche maka ịkụ Ekweremadu ihe bụkwa nke kwesiri ndị ndu nzuzu anyị nwere.

O kwuru sị ” Obi tọrọ m ụtọ n’ihe ha mere Ike Ekweremadu na Nuremberg, Gamanị. Ndị òtù IPOB kwesiri ịna aka nakwa ihe nrite pụrụ iche. Nke a bụ ihe ịmaatụ bụ ịgba bụkwa nke ndị ndu Naịjirịa kwesiri inweta mgbe ọ bụla ha gara mba ofesi ma chee na ha ga-agbarị ego anyị. Ọ bụ Chukwu ga-akpọ ha ọkụ”