Skip to content

BUHARI GA-EME NJEM NA NEW YORK MAKA NZỤKỌ OTU MBA ỤWA

Onye minista na-ahu maka ihe na-eme n’obodo ndị ọzọ bụ Goeffrey Onyeama, ekwuola na onyeisiala bụ Mohammadu Buhari ga-ebido njem na mba New York maka otu nzụkọ mba ụwa nke agba ịrị asaa na atọ ya bụkwa nke ga ebido ma ọnwa itolu gbaa abalị ịrị na asatọ.

Gukwuo:NDỊ OTU NZUZO EWETALA ỌGBAGHARA N’OLILI OZU ONYE OTU HA NA STEETI BAUCHI

Onyeama kwuru nke a mgbe ya na ndị ntọ akụkọ na-akparita na Tuzdee . O jikwara ohere ahụ kwuo na Buhari ga-eji ohere ahu kwụwa ọnọdu  obodo anyị bụ Naịjịrịa na mba ụwa.

Onyeịsịala so n’otu ndi ndu mba ụwa ga-ekwu okwu na nzụkọ ahụ.

Onyeama kwukwara na Onyeịsịala ga-eduru ụfọdụ ndị minista, ndị isi otu gọmenti dị iche iche nakwa ndị ode akwụkwọ ukwu na njem ahụ.