Skip to content

ATIKU AHỌRỌLA PETER OBI MAKA ỌKWA OSOTE ONYEISIALA

Atiku Abubakar bụ onye ga-esi aha òtù pati PDP dọọ ọkwa onyeisiala ahọrọla Peter Obi maka ọkwa osote onyeisiala.

Atiku mere nke a taa n’ụlọ ya dị n’Abuja.

Peter Obi so n’otu n’me ndị a na-ekwu na Atiku nwere ihe ihọrọ maka ọkwa osote onyeisiala.

Atiku nọrọ n’ụbọchị Sọnde nweta mmeri dịka onye ga-eji aha PDP zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka elu a ga-eme n’afọ 2019.