Skip to content

APC AMABICHIELA OKOROCHA NA PATI HA

Pati APC na steeti Imo amabichiela aka na-achị steeti ahụ bụ Rochas Okorocha  na pati ha. N’ozi ha n’ụbọchị Tọzdee, ha boro ya ebubo ma ime ihe ndị pati ahụ na-anabataghị.

Okorocha ka a hụrụ n’ọgbọ nta vootu APC  na steeti ahụ ka ọ nọ na-achụ nta vootu maka maka pati Action Aalliance (AA) bụkwa pati ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu ji adọ ọkwa gọvanọ.

Okorocha mere nke a n’agbanyeghị na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari nọ ebe ahụ.

Onyeisioche nlekọta pati ahụ na steeti Imo bụ Prince Marcellinus Nlemigbo, kwuru n’akwụkwọ na-egosi nke a ka ha zigarala onyeisioche pati ahụ n’ala anyị.

Nlemigbo gakwara n’ihu kwuo na ha mere nke a iji nye Okorocha ohere Ịbanye na pati ya bụ AA nke ọma.

 

TRANSLATION

The Imo State chapter of the All Progressives Congress (APC) has suspended Rochas Okorocha, Governor of Imo State.

Announcing his suspension on Thursday, the party accused the governor of “gross anti-party” activities.

Okorocha was seen campaigning for his son-in-law, a member of Action Alliance, during an APC campaign rally in the state.

The governor did this without recourse to Aisha Buhari, the wife of the president, who was present at the rally.

The Imo State Caretaker Committee Chairman of the party, Prince Marcellinus Nlemigbo, said that a letter conveying the message has been sent to the National Chairman of the party.

Nlemigbo added that the decision was to save the party from the “machinations of Okorocha”, with the expulsion giving him time so that he can fully move to his party, the Action Alliance (AA).”