Skip to content

ANYị ACHỌGHị IWEPU AMBODE DịKA GỌVANỌ – OBASA

Ndị ụlọ nzụkọ omeiwu nke steeti Legọs ekwuola n’enweghị mgbe ha jị nwee mkpebi iwepu aka n’achị steeti ahụ bụ Akinwunmi Ambode.

Onye n’ekwuchitere ndị ụlọ nzụkọ omeiwu ahụ ọnụ bụ Mudashiru Obasa nọrọ n’ụbọchị Mọnde kwuo na enweghị eziokwu dị n’akụkọ ndị mmadụ na-agbasa ebe niile gbasara iwepu Ambode dịka gọvanọ.

GUKWUO: EKWEREMADU NWERE IKE IHAPỤ PDP

Obasa gara n’ihu kwuo na ọ bụrụ na a ga-ewepu Ambode na ndị mmadụ ga-amata.  Obasa kwukwara na ha na Ambode na-arụkọ iji weta mmepe na steeti Legọs.