Skip to content

ANWỤCHIELA OTU NWOKE MAKA IGBỤ NAKWA IGHỤRỤ ONYE UWEOJII ANYA NA KATSINA STEETI

Ndị uweojii anwụchiela otu okenye na-agwo ọgwụ na steeti Katsina aha ya bụ Hassaini Musa maka ịgbụ nakwa ịghụrụ otu onye uweojii anya. Hassaini gbara afọ ịrị asatọ.

GUKWUO: CHIMAMANDA ADICHIE ENWETALA IHE NRITE NKE EVERETT M. ROGERS NKE AFỌ 2019

Onye komịshịọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mohammed Wakili kwuru na nwoke a na-agwọ ọgwụ ka a nwụchịrị ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ maka ịgbụ otu onye uweojii aha ya bụ Sergeant Unana Ishaya bụkwa onye na-arụ ọrụ na steeti Plateau.

Onye komịshịọna gara n’ihụ kwuo na mmadụ abụọ ahụ gburu onye uweojii ahụ ma ghụrụkwa anya ya dịka ọnọdụ Hassaini nyere ha maka ịgwọ ọgbụ nke ga-eme ka anya nkịtị hapụ ihụ ha.

Otu onye n’ime ndị a kpara arụ a kwuru na ha chọrọ igwọ ọgwụ ahụ iji zuo ndi EFCC ohi na Jos.